Tupu ugbua, Labour Pati enwebụghị omeiwu ọbụla ma na steeti, ma n'ụlọ omeiwu etiti. Taa, ndị omeiwu Labour Pati na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kazi n'ọnụọgụgụ.
Akụkọ si obodo Umunze nke okpuruọchịchị Orumba South n’Anambra steeti apụta gosiri na ọtụtụ ụmụnwaanyị obodo ahụ mere ngagharịiwe taa iji gosi iwe ha maka akụkọ ọjọọ dapụtara ebe ahụ na nso nso a.